15Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke.
16Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.”
17Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma.
18Ike ga-agwụ gị, gwụkwa igwe mmadụ ndị a. Ọrụ a ị na-arụ dị ukwuu karịa gị. Naanị gị agaghị ebuli ya.
19Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke.