11jikerekwa nʼụbọchị nke atọ. Nʼihi na m ga-arịdata nʼelu ugwu Saịnaị nʼihu mmadụ niile.
12Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’
13Agaghị emetụ onye mmebi iwu ahụ aka, kama, a ga-eji nkume tugbuo ya, maọbụ e were àkụ gbagbuo ya, maọbụ mmadụ maọbụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ. Mmadụ ọbụla agaghị abịaru ugwu ahụ nso, ruo mgbe ha nụrụ opi nke a ga-afụ. Mgbe ahụ, ha nwere ike bịa nso ugwu ahụ.”
14Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha.
15Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.”