Ọpụpụ 19

Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha.

Exodus 19:14 (UKJV) And Moses went down from the mount unto the people, and sanctified the people; and they washed their clothes.

12Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’

13Agaghị emetụ onye mmebi iwu ahụ aka, kama, a ga-eji nkume tugbuo ya, maọbụ e were àkụ gbagbuo ya, maọbụ mmadụ maọbụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ. Mmadụ ọbụla agaghị abịaru ugwu ahụ nso, ruo mgbe ha nụrụ opi nke a ga-afụ. Mgbe ahụ, ha nwere ike bịa nso ugwu ahụ.”

14Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha.

15Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.”

16Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.