Ọpụpụ 19

Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji.

Exodus 19:16 (UKJV) And it came to pass on the third day in the morning, that there were thunders and lightnings, and a thick cloud upon the mount, and the voice of the trumpet exceeding loud; so that all the people that was in the camp trembled.

14Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha.

15Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.”

16Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji.

17Mosis duuru ndị mmadụ ahụ niile si nʼụlọ ikwu ha pụta gaa izute Chineke. Ha niile guzokwara nʼala ugwu ahụ.

18Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! Onyenwe anyị rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.