Ọpụpụ 19

Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ Onyenwe anyị anya ka ha ghara ịla nʼiyi.

Exodus 19:21 (UKJV) And the LORD said unto Moses, Go down, charge the people, lest they break through unto the LORD to gaze, and many of them perish.

19Mgbe opi ike ahụ na-ada ike ike, Mosis malitere ịgwa Chineke okwu. Chineke zaghachiri Mosis okwu site nʼolu dara ụda dịka egbe eluigwe.

20Onyenwe anyị rịdatara bịaruo nʼelu ugwu Saịnaị. Ọ gwara Mosis ka ọ rịgota bịa zute ya. Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ ijekwuru Chineke.

21Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ Onyenwe anyị anya ka ha ghara ịla nʼiyi.

22Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru Onyenwe anyị nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, Onyenwe anyị ga-eme ka ha niile nwụọ.”

23Mosis zaghachiri Onyenwe anyị sị, “Ndị mmadụ agaghị arịgota nʼugwu Saịnaị nʼihi na gị onwe gị adọọla anyị aka na ntị sị, ‘Kpaanụ oke gburugburu ugwu a, doo ya nsọ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.