Ọpụpụ 2

Ma onye ahụ jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ahụ?” Mgbe ahụ Mosis tụrụ ụjọ. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Ndị mmadụ amatala banyere ihe ahụ m mere.”

Exodus 2:14 (UKJV) And he said, Who made you a prince and a judge over us? intend you to kill me, as you killed the Egyptian? And Moses feared, and said, Surely this thing is known.

12Mosis lere anya nʼakụkụ abụọ. Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o gburu onye Ijipt ahụ, lie ya nʼime aja.

13Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?”

14Ma onye ahụ jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ahụ?” Mgbe ahụ Mosis tụrụ ụjọ. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Ndị mmadụ amatala banyere ihe ahụ m mere.”

15Mgbe Fero nụrụ ihe Mosis mere, ọ gbalịrị igbu Mosis. Ma Mosis si nʼihu Fero gbapụ ọsọ gbaga ala Midia. Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri.

16Ma o nwere otu onye nchụaja obodo Midia mụtara ụmụ agbọghọ asaa. Nʼoge a, ha bịara iseta mmiri na ịgbanye ya nʼime ihe ịgbanye mmiri anụ ụlọ maka inye igwe anụ ụlọ nna ha mmiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.