Ọpụpụ 2

Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?”

Exodus 2:18 (UKJV) And when they came to Reuel their father, he said, How is it that all of you are come so soon to day?

16Ma o nwere otu onye nchụaja obodo Midia mụtara ụmụ agbọghọ asaa. Nʼoge a, ha bịara iseta mmiri na ịgbanye ya nʼime ihe ịgbanye mmiri anụ ụlọ maka inye igwe anụ ụlọ nna ha mmiri.

17Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri.

18Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?”

19Ha zara nna ha sị, “Otu onye Ijipt napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.”

20Nna ha jụrụ ha sị, “Olee ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya nʼebe ahụ? Gaanụ kpọọ ya ka o soro anyị rie nri.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.