17Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri.
18Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?”
19Ha zara nna ha sị, “Otu onye Ijipt napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.”
20Nna ha jụrụ ha sị, “Olee ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya nʼebe ahụ? Gaanụ kpọọ ya ka o soro anyị rie nri.”
21Mosis nabatara oku ahụ Reuel kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere Mosis Zipọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.