17“Aghaghị ime ka onye ọbụla ga-akpọ nna ya maọbụ nne ya iyi nwụọ.
18“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ alụọ ọgụ ma otu nʼime ha ewere nkume maọbụ osisi tie onye nke ọzọ. Ọ bụrụ na ọ nwụghị, kama na o merụrụ ahụ, dinaakwa nʼihe ndina ya,
19ọ bụrụ na onye ahụ ebilie were mkpara ya na-ejegharị, ikpe agaghị ama onye ahụ tiri ya ihe, kama ọ ga-akwụ ụgwọ ihe onye ahụ ji gwọọ onwe ya, na oge onye ahụ o tiri ihe ji nọọ nʼihe ndina, ruo mgbe ahụ ya ga-adị mma.
20“Ọ bụrụ na ohu ọbụla anwụọ site nʼihe otiti nke onyenwe ya tiri ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, a ga-adọ onyenwe ya aka na ntị site nʼinye ya ntaramahụhụ.
21Otu ọ dị, ọ bụrụ na ohu ahụ dị ndụ nʼụbọchị mbụ, maọbụ nʼụbọchị nke abụọ, a gaghị enye onyenwe ya ntaramahụhụ nʼihi na ohu ahụ bụ akụ ya.