Ọpụpụ 22

Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.

Exodus 22:13 (UKJV) If it be torn in pieces, then let him bring it for witness, and he shall not make good that which was torn.

11mgbe ahụ, onye agbataobi ahụ e nyere anụ ndị a nʼaka idebe ga-aṅụ iyi nʼihu Onyenwe anyị. Iyi ahụ ọ ṅụrụ ga-egosi onyenwe anụ ụlọ ahụ na o zughị ya nʼohi. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụghachi ụgwọ ọbụla.

12Ma ọ bụrụ na o zuru anụ ụlọ ahụ nʼohi site na nke agbataobi ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ụgwọ niile nye onyenwe ya.

13Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.

14“Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya.

15Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.