12Ma ọ bụrụ na o zuru anụ ụlọ ahụ nʼohi site na nke agbataobi ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ụgwọ niile nye onyenwe ya.
13Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.
14“Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya.
15Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ.
16“Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya.