17Ọ bụrụ na nna nwaagbọghọ ahụ ekwenyeghị ka nwoke ahụ lụọ ya, nwoke ahụ aghaghị ịkwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ.
18“E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ.
19“Onye ọbụla ya na anụ ọbụla dinakọrọ, e kwesiri ime ka ọ nwụọ.
20“Onye ọbụla chụrụ aja nye chi ọzọ ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị, a ga-eme ka ọ nwụọ.
21“Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt.