19“Onye ọbụla ya na anụ ọbụla dinakọrọ, e kwesiri ime ka ọ nwụọ.
20“Onye ọbụla chụrụ aja nye chi ọzọ ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị, a ga-eme ka ọ nwụọ.
21“Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt.
22“Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna.
23Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka.