Ọpụpụ 22

Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka.

Exodus 22:23 (UKJV) If you afflict them in any way, and they cry at all unto me, I will surely hear their cry;

21“Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt.

22“Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna.

23Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka.

24Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna.

25“Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.