Ọpụpụ 22

Ọ bụrụ na onye ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, maọbụ atụrụ ya, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla furu efu, nke mmadụ na-asị, ‘Nke a bụ ya.’ Mmadụ abụọ ndị a ga-aga nʼihu ndị ikpe. Onye ọbụla ndị ikpe a mara ikpe ga-akwụghachi ibe ya ụgwọ okpukpu abụọ.

Exodus 22:9 (UKJV) For all manner of trespass, whether it be for ox, for ass, for sheep, for raiment, or for any manner of lost thing which another challenges to be his, the cause of both parties shall come before the judges; and whom the judges shall condemn, he shall pay double unto his neighbour.

7“Ọ bụrụ na mmadụ enye enyi ya maọbụ onye agbataobi ya ego, maọbụ ihe ọbụla ka o debere ya, ma onye ohi agaa zuru ya site nʼụlọ ya, a si na e jide onye ohi dị otu a, ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe o zuru okpukpu abụọ.

8Ọ bụrụ na a chọpụtaghị onye ohi ahụ, onye nwe ụlọ ahụ aghaghị ịbịa nʼihu Chineke, ka a chọpụta maọbụ ya nʼonwe ya setịpụrụ aka were ihe ahụ, bụ akụ nke onye ọzọ kpatara.

9Ọ bụrụ na onye ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, maọbụ atụrụ ya, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla furu efu, nke mmadụ na-asị, ‘Nke a bụ ya.’ Mmadụ abụọ ndị a ga-aga nʼihu ndị ikpe. Onye ọbụla ndị ikpe a mara ikpe ga-akwụghachi ibe ya ụgwọ okpukpu abụọ.

10“Ọ bụrụ na anụ ụlọ mmadụ nyere onye agbataobi ya nʼaka idebe anwụọ, maọbụ merụọ ahụ, maọbụ gbafuo, ma anụ ụlọ ahụ ọ bụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ anụ ụlọ ọzọ, ọ bụrụ na ọ dịghị onye hụrụ mgbe ihe ndị a dakwasịrị anụ ụlọ ahụ,

11mgbe ahụ, onye agbataobi ahụ e nyere anụ ndị a nʼaka idebe ga-aṅụ iyi nʼihu Onyenwe anyị. Iyi ahụ ọ ṅụrụ ga-egosi onyenwe anụ ụlọ ahụ na o zughị ya nʼohi. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụghachi ụgwọ ọbụla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.