Ọpụpụ 23

“Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

Exodus 23:17 (UKJV) Three items in the year all your males shall appear before the LORD God.

15“Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. “Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m.

16“Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu. “Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla. Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile.

17“Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

18“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m. “Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.

19“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.