17“Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
18“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m. “Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.
19“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.
20“Lee, ana m eziga mmụọ ozi nʼihu unu, ichebe unu nʼije unu nakwa ịkpọbatakwa unu nʼebe ahụ M doziri nye unu.
21Geenụ ya ntị, nụrụkwa olu ya. Unu enupukwarala ya isi, nʼihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu niile, nʼihi na Aha m dị nʼime ya.