22Ọ bụrụ na unu elezie anya nke ọma, gee ya ntị, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu, mgbe ahụ, mụ onwe m ga-abụkwara ndị iro unu onye iro, megidekwa ndị na-emegide unu.
23Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile.
24Unu agaghị akpọ isiala nye chi ha niile. Unu efekwala ha, maọbụ gbasoro omenaala ha. Kama, kwatuonụ ha. Tipịasịakwanụ ebe nkume nsọ niile nke chi ha.
25Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu.
26Nwanyị aga na nwanyị ime ya na-apụ agaghị adị nʼala unu. Aga m emekwa ka unu nwee ogologo ndụ.