Ọpụpụ 23

Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu.

Exodus 23:25 (UKJV) And all of you shall serve the LORD your God, and he shall bless your bread, and your water; and I will take sickness away from the midst of you.

23Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile.

24Unu agaghị akpọ isiala nye chi ha niile. Unu efekwala ha, maọbụ gbasoro omenaala ha. Kama, kwatuonụ ha. Tipịasịakwanụ ebe nkume nsọ niile nke chi ha.

25Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu.

26Nwanyị aga na nwanyị ime ya na-apụ agaghị adị nʼala unu. Aga m emekwa ka unu nwee ogologo ndụ.

27“Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.