25Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu.
26Nwanyị aga na nwanyị ime ya na-apụ agaghị adị nʼala unu. Aga m emekwa ka unu nwee ogologo ndụ.
27“Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ.
28Ọzọkwa, aga m eziga ebu ka ọ chụpụ ndị Hiv na ndị Kenan na ndị Het site nʼụzọ unu.
29Ma agaghị m achụpụ ha nʼotu afọ, nʼihi na nke a ga-eme ka ala ahụ niile tọgbọrọ nʼefu, ụmụ anụ ọhịa a baa ụba karịa unu.