2“Ị gaghị eso igwe mmadụ mee ihe ọjọọ. Mgbe ị na-agba akaebe nʼụlọikpe, ị gaghị esonye igwe mmadụ ndị na-atụgharị ikpe ziri ezi.
3Nʼebe nwa ogbenye nọ, ị gaghị ekpelara ya nʼoge ikpe nʼihi na ọ bụ nwa ogbenye.
4“Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu nke kpafuru akpafu, ọ bụrụkwa na ọ bụ nke onye iro gị, duru ya dulatara onye iro gị ahụ.
5Ọ bụrụ na ị hụ onye kpọrọ gị asị ka ọ na-agbalị iwelite ịnyịnya ibu ya nke dara nʼihi ibu dị arọ o bu, elefula ya anya, kama gaa nyere ya aka bulite ịnyịnya ahụ.
6“Ewezugala ikpe ziri ezi nʼebe ndị ogbenye nọ, nʼihi ọnọdụ ogbenye ha.