17Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril,
18nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
19Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti.
20Nʼahịrị nke anọ, ga-abụ nkume topaazi, ọniks na jaspa. Hịọnye ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.
21Ha niile ga-adị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.