18nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
19Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti.
20Nʼahịrị nke anọ, ga-abụ nkume topaazi, ọniks na jaspa. Hịọnye ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.
21Ha niile ga-adị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
22“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.