Ọpụpụ 28

Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril,

Exodus 28:17 (UKJV) And you shall set in it settings of stones, even four rows of stones: the first row shall be a ruby, a topaz, and a carbuncle: this shall be the first row.

15“Ị ga-adụ ihe mgbochi obi nke ikpe, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Mee ya dịka efọọd ahụ: jiri ogho edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee ya.

16Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara, nke apịajiri ụzọ abụọ.

17Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril,

18nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.

19Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.