Ọpụpụ 28

Meekwara ụmụ ndị ikom Erọn uwe ime ahụ, ihe ike nʼukwu na akwa ike nʼisi, inye ha ugwu na nsọpụrụ.

Exodus 28:40 (UKJV) And for Aaron's sons you shall make coats, and you shall make for them girdles, and bonnets shall you make for them, for glory and for beauty.

38Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn. Ọ ga-ebukwa ikpe ọmụma metụtara njehie gbasara ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel doro nsọ, na onyinye ha niile. Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn mgbe niile, ka ha bụrụ ndị Onyenwe anyị ga-anabata.

39“Jiri ezi akwa ọcha kpaa uwe ime ahụ. Werekwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi ahụ. Ihe ike nʼukwu ahụ ga-abụ ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma.

40Meekwara ụmụ ndị ikom Erọn uwe ime ahụ, ihe ike nʼukwu na akwa ike nʼisi, inye ha ugwu na nsọpụrụ.

41Mgbe i yinyekwasịrị Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a, tee ha mmanụ, doo ha nsọ. Chee ha nʼihu m ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.

42“Meekwara ha uwe ụkwụ nke eji akwa ọcha mee, maka ikpuchi anụ ahụ ha. Ọ ga-esite nʼukwu ruo nʼikpere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.