39“Jiri ezi akwa ọcha kpaa uwe ime ahụ. Werekwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi ahụ. Ihe ike nʼukwu ahụ ga-abụ ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma.
40Meekwara ụmụ ndị ikom Erọn uwe ime ahụ, ihe ike nʼukwu na akwa ike nʼisi, inye ha ugwu na nsọpụrụ.
41Mgbe i yinyekwasịrị Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a, tee ha mmanụ, doo ha nsọ. Chee ha nʼihu m ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
42“Meekwara ha uwe ụkwụ nke eji akwa ọcha mee, maka ikpuchi anụ ahụ ha. Ọ ga-esite nʼukwu ruo nʼikpere.
43Erọn na ụmụ ya ndị ikom aghaghị iyi ha mgbe niile ha ga-aba nʼime ụlọ nzute, maọbụ mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja ije ozi nʼEbe Nsọ. Ka ha ghara imeta ihe ikpe ọmụma, ma nwụọ. “Nke a ga-abụ iwu na ụkpụrụ ebighị ebi, nke ga-adịrị Erọn na ụmụ ụmụ ya.