Ọpụpụ 28

Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn. Ọ ga-ebukwa ikpe ọmụma metụtara njehie gbasara ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel doro nsọ, na onyinye ha niile. Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn mgbe niile, ka ha bụrụ ndị Onyenwe anyị ga-anabata.

Exodus 28:38 (UKJV) And it shall be upon Aaron's forehead, that Aaron may bear the iniquity of the holy things, which the children of Israel shall hallow in all their holy gifts; and it shall be always upon his forehead, that they may be accepted before the LORD.

36“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee efere ntakịrị, gbunye akara dị otu a nʼelu ya: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.

37Kenye eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ; ọ ga-adị nʼihu akwa ike nʼisi ahụ.

38Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn. Ọ ga-ebukwa ikpe ọmụma metụtara njehie gbasara ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel doro nsọ, na onyinye ha niile. Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn mgbe niile, ka ha bụrụ ndị Onyenwe anyị ga-anabata.

39“Jiri ezi akwa ọcha kpaa uwe ime ahụ. Werekwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi ahụ. Ihe ike nʼukwu ahụ ga-abụ ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma.

40Meekwara ụmụ ndị ikom Erọn uwe ime ahụ, ihe ike nʼukwu na akwa ike nʼisi, inye ha ugwu na nsọpụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.