Ọpụpụ 29

Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie.

Exodus 29:14 (UKJV) But the flesh of the bullock, and his skin, and his dung, shall you burn with fire without the camp: it is a sin offering.

12Jiri mkpịsịaka gị rụta ụfọdụ nʼime ọbara oke ehi ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Wụpụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja.

13Were abụba niile kpuchiri ihe ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.

14Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie.

15“Were otu nʼime ebule ndị ahụ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.

16Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.