Ọpụpụ 29

Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja.

Exodus 29:16 (UKJV) And you shall slay the ram, and you shall take his blood, and sprinkle it round about upon the altar.

14Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie.

15“Were otu nʼime ebule ndị ahụ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.

16Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja.

17Bọwasịa ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, sachaa eriri afọ ya na ihe dị ya nʼime, ha na ụkwụ ya niile, tinyekọ ha na isi ya na akụkụ anụ ndị ọzọ.

18Kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke isisi ya dị ezi mma. Aja a chụrụ nye Onyenwe anyị site nʼọkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.