Ọpụpụ 29

“Were otu nʼime ebule ndị ahụ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.

Exodus 29:15 (UKJV) You shall also take one ram; and Aaron and his sons shall put their hands upon the head of the ram.

13Were abụba niile kpuchiri ihe ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.

14Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie.

15“Were otu nʼime ebule ndị ahụ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.

16Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja.

17Bọwasịa ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, sachaa eriri afọ ya na ihe dị ya nʼime, ha na ụkwụ ya niile, tinyekọ ha na isi ya na akụkụ anụ ndị ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.