Ọpụpụ 29

Ị ga-esite nʼelu ebe ịchụ aja were ụfọdụ ọbara, ya na ụfọdụ mmanụ nsọ, fesa ya nʼahụ Erọn na nʼelu uwe ya, nʼahụ ụmụ ya ndị ikom, nakwa nʼelu uwe ha niile. Mgbe ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom ga-abụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ha na uwe ha.

Exodus 29:21 (UKJV) And you shall take of the blood that is upon the altar, and of the anointing oil, and sprinkle it upon Aaron, and upon his garments, and upon his sons, and upon the garments of his sons with him: and he shall be hallowed, and his garments, and his sons, and his sons' garments with him.

19“Were ebule nke ọzọ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-ebikwasị aka ha nʼelu isi ya.

20Gbuo ya. Were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn na ụmụ ya nʼọnụ ntị aka nri ha, na isi mkpụrụ aka nke aka nri ha, ya na isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ha. Werekwa ọbara nke fọdụrụ fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja ahụ.

21Ị ga-esite nʼelu ebe ịchụ aja were ụfọdụ ọbara, ya na ụfọdụ mmanụ nsọ, fesa ya nʼahụ Erọn na nʼelu uwe ya, nʼahụ ụmụ ya ndị ikom, nakwa nʼelu uwe ha niile. Mgbe ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom ga-abụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ha na uwe ha.

22“Were abụba ebule ahụ, na akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba nke kpuchiri ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba gbara ha gburugburu, na apata aka nri ya (nʼihi na ebule ahụ bụ ebule ido nsọ),

23site na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke na-adị nʼihu Onyenwe anyị. Were otu achịcha dị gburugburu, otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.