Ọpụpụ 29

“Ma nke a bụ ihe ị ga-achụ nʼelu ebe ịchụ aja kwa ụbọchị, ị ga-eji ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ chụọ aja.

Exodus 29:38 (UKJV) Now this is that which you shall offer upon the altar; two lambs of the first year day by day continually.

36Ị ga-achụ aja oke ehi dịka aja mmehie maka ikpuchi mmehie kwa ụbọchị. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụ aja m dị ọcha, site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie nʼelu ya, na ite ya mmanụ nʼihi iji doo ya nsọ.

37Ụbọchị asaa ka ị ga-edo ebe ịchụ aja nsọ site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie. Mgbe ahụ ebe ịchụ aja ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ebe ịchụ aja ahụ ga-adị nsọ.

38“Ma nke a bụ ihe ị ga-achụ nʼelu ebe ịchụ aja kwa ụbọchị, ị ga-eji ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ chụọ aja.

39Chụọ otu nʼoge ụtụtụ; chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.

40Ị ga-ewere nwa atụrụ, tinyere lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja. Wetakwa otu lita mmanya dịka aja ihe ọṅụṅụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.