34Ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime anụ na achịcha ido nsọ ndị ahụ afọdụ ruo ụtụtụ, a ga-akpọ ha ọkụ. A gaghị eri ya ọzọ, nʼihi na ọ bụ ihe dị nsọ.
35“Ọ bụ otu a ka a ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, dịka ihe niile m nyere gị nʼiwu si dị. Ọ ga-ewe ụbọchị asaa iji doo ha nsọ.
36Ị ga-achụ aja oke ehi dịka aja mmehie maka ikpuchi mmehie kwa ụbọchị. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụ aja m dị ọcha, site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie nʼelu ya, na ite ya mmanụ nʼihi iji doo ya nsọ.
37Ụbọchị asaa ka ị ga-edo ebe ịchụ aja nsọ site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie. Mgbe ahụ ebe ịchụ aja ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ebe ịchụ aja ahụ ga-adị nsọ.
38“Ma nke a bụ ihe ị ga-achụ nʼelu ebe ịchụ aja kwa ụbọchị, ị ga-eji ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ chụọ aja.