Ọpụpụ 3

“Ndị okenye Izrel ga-anabata ozi gị. Mgbe ahụ gị na ha ga-eso gaa nʼihu eze Ijipt gwa ya sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru ezutela anyị. Kwere ka anyị gaa njem nʼime ọzara abalị atọ gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja.’

Exodus 3:18 (UKJV) And they shall hearken to your voice: and you shall come, you and the elders of Israel, unto the king of Egypt, and all of you shall say unto him, The LORD God of the Hebrews has met with us: and now let us go, we plead to you, three days' journey into the wilderness, that we may sacrifice to the LORD our God.

16“Gaa, kpọkọta ndị okenye Izrel niile zie ha sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb, egosila m onwe ya, sị m, Eleruola m ọnọdụ unu anya hụ ihe a na-eme unu nʼala Ijipt.

17Ekweela m nkwa ịkpọpụta unu site nʼahụhụ unu na-ahụ nʼala Ijipt duru unu baa nʼala nke ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi nʼime ya. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’

18“Ndị okenye Izrel ga-anabata ozi gị. Mgbe ahụ gị na ha ga-eso gaa nʼihu eze Ijipt gwa ya sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru ezutela anyị. Kwere ka anyị gaa njem nʼime ọzara abalị atọ gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja.’

19Amaara m rịị na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa, tutu ruo mgbe e ji aka ike kwagide ya.

20Ma aga m esetipụ aka m tie Ijipt ihe otiti, site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke m ga-eme nʼetiti ya. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.