Ọpụpụ 30

Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

Exodus 30:11 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses, saying,

9Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya.

10Otu ugbo nʼafọ Erọn ga-ekpuchi mmehie nʼelu mpi ya. Mmemme mkpuchi mmehie a nke a na-eme otu ugbo nʼafọ, aghaghị ịbụ nke e ji ọbara nke si nʼaja a chụrụ nʼihi mkpuchi mmehie, nʼihi ọgbọ niile nke na-abịa. A ga na-edo ebe ịchụ aja nsọ otu a. Nke a bụ ebe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.”

11Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

12“Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ Onyenwe anyị ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ.

13Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ. Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.