8Nʼanyasị kwa, mgbe ọ na-amụnye ọkụ nʼoriọna ahụ, ọ ga-esurekwa ihe nsure ọkụ. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke ga-adị nʼihu Onyenwe anyị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
9Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya.
10Otu ugbo nʼafọ Erọn ga-ekpuchi mmehie nʼelu mpi ya. Mmemme mkpuchi mmehie a nke a na-eme otu ugbo nʼafọ, aghaghị ịbụ nke e ji ọbara nke si nʼaja a chụrụ nʼihi mkpuchi mmehie, nʼihi ọgbọ niile nke na-abịa. A ga na-edo ebe ịchụ aja nsọ otu a. Nke a bụ ebe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.”
11Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
12“Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ Onyenwe anyị ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ.