Ọpụpụ 30

Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ. Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị.

Exodus 30:13 (UKJV) This they shall give, every one that passes among them that are numbered, half a shekel after the shekel of the sanctuary: (a shekel is twenty gerahs:) an half shekel shall be the offering of the LORD.

11Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

12“Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ Onyenwe anyị ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ.

13Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ. Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị.

14Ndị kwesiri inye onyinye a bụ ndị niile gbara iri afọ abụọ gbagoo. Ọ bụ ndị a kwesiri inye Onyenwe anyị onyinye a.

15Ndị ọgaranya agaghị enye karịa ọkara shekel. Otu a kwa ndị ogbenye agaghị enye ihe dị ntakịrị karịa ọkara shekel. Nʼihi na onyinye a bụ onyinye unu na-enye Onyenwe anyị maka ikpuchiri mkpụrụobi unu mmehie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.