Ọpụpụ 30

Ndị ọgaranya agaghị enye karịa ọkara shekel. Otu a kwa ndị ogbenye agaghị enye ihe dị ntakịrị karịa ọkara shekel. Nʼihi na onyinye a bụ onyinye unu na-enye Onyenwe anyị maka ikpuchiri mkpụrụobi unu mmehie.

Exodus 30:15 (UKJV) The rich shall not give more, and the poor shall not give less than half a shekel, when they give an offering unto the LORD, to make an atonement for your souls.

13Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ. Ọkara shekel a bụ onyinye nye Onyenwe anyị.

14Ndị kwesiri inye onyinye a bụ ndị niile gbara iri afọ abụọ gbagoo. Ọ bụ ndị a kwesiri inye Onyenwe anyị onyinye a.

15Ndị ọgaranya agaghị enye karịa ọkara shekel. Otu a kwa ndị ogbenye agaghị enye ihe dị ntakịrị karịa ọkara shekel. Nʼihi na onyinye a bụ onyinye unu na-enye Onyenwe anyị maka ikpuchiri mkpụrụobi unu mmehie.

16Nabata ego niile ndị a site nʼaka ụmụ Izrel, ma jiri ya jee ozi dị nʼụlọ nzute. Ihe onyinye a ga-eme bụ ịkpọtụ uche Onyenwe anyị nʼebe unu nọ nʼihi mkpuchi mmehie maka ndụ unu.”

17Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.