1“Jiri osisi akashia rụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
2Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya ga-adị iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya ga-adị iri sentimita itoolu. Mpi ya niile ga-esi na ya pụta.
3Jiri ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya, akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ị ga-ejikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu.
4Kpụnye mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọbụla, ebe ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.
5Ị ga-eji osisi akashia mee mkpara, jiri ọlaedo machie ha.