4Kpụnye mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọbụla, ebe ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.
5Ị ga-eji osisi akashia mee mkpara, jiri ọlaedo machie ha.
6Ị ga-adọba ebe ịchụ aja ahụ nʼihu akwa mgbochi nke kpuchiri igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihu oche ebere ahụ dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ, nʼebe m ga-ezute gị.
7“Ụtụtụ niile, mgbe Erọn doziri oriọna, ọ ga-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
8Nʼanyasị kwa, mgbe ọ na-amụnye ọkụ nʼoriọna ahụ, ọ ga-esurekwa ihe nsure ọkụ. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke ga-adị nʼihu Onyenwe anyị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.