Ọpụpụ 31

Ndị Izrel ga-edebe ụbọchị Izuike, na-eme mmemme ya nʼọgbọ niile, dịka ọgbụgba ndụ nke ebighị ebi.

Exodus 31:16 (UKJV) Wherefore the children of Israel shall keep the sabbath, to observe the sabbath throughout their generations, for a perpetual covenant.

14“ ‘Ụbọchị izuike m dị nsọ nye unu. Nʼihi nke a, unu ga-edebe ya nsọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla edebeghị ya nsọ, ọ ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla arụọ ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike m, a ga-ewezuga ya site nʼebe unu nọ.

15Ụbọchị isii ka unu ga-arụ ọrụ unu niile. Ma ụbọchị nke asaa dị iche. Ọ bụ ụbọchị izuike. Ọ bụkwa ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, onye ọbụla rụrụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị Izuike ga-anwụ.

16Ndị Izrel ga-edebe ụbọchị Izuike, na-eme mmemme ya nʼọgbọ niile, dịka ọgbụgba ndụ nke ebighị ebi.

17Ọ ga-abụ ihe ịrịbama nke ga-adịgide nʼetiti mụ na ndị Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na nʼụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa. Ọ kwụsịrị ọrụ nʼụbọchị nke asaa, zuo ike, turu ndụ.’ ”

18Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Mosis okwu ndị a nʼelu ugwu Saịnaị, o nyere ya mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Ọ bụkwa mbadamba nkume ndị ahụ nke mkpịsịaka Chineke dere ihe nʼelu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.