32Ma ugbu a, biko, gbaghara mmehie ha. Ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko hichapụ aha m site nʼakwụkwọ ahụ i dere.”
33Ma Onyenwe anyị zara sị Mosis, “Onye ọbụla mehiere megide m ka a ga-ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ m.
34Ma ugbu a, duru ndị a gaa ebe ahụ m gwara gị. Mmụọ ozi m ga-edu unu nʼije a. Ma otu ọ dị, mgbe m bịara ileta ndị a, aga m ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”
35Ya mere, Onyenwe anyị mere ka ọrịa dị egwu bịakwasị ha, nʼihi ihe ha ji nwa ehi ahụ, bụ nke Erọn kpụrụ mee.