Ọpụpụ 32

Ma Onyenwe anyị zara sị Mosis, “Onye ọbụla mehiere megide m ka a ga-ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ m.

Exodus 32:33 (UKJV) And the LORD said unto Moses, Whosoever has sinned against me, him will I blot out of my book.

31Ya mere, Mosis jekwuuru Onyenwe anyị sị ya, “Biko Onyenwe anyị, ndị a emeela mmehie dị ukwuu megide gị, nʼihi na ha akpụọlara onwe ha chi ọlaedo.

32Ma ugbu a, biko, gbaghara mmehie ha. Ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko hichapụ aha m site nʼakwụkwọ ahụ i dere.”

33Ma Onyenwe anyị zara sị Mosis, “Onye ọbụla mehiere megide m ka a ga-ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ m.

34Ma ugbu a, duru ndị a gaa ebe ahụ m gwara gị. Mmụọ ozi m ga-edu unu nʼije a. Ma otu ọ dị, mgbe m bịara ileta ndị a, aga m ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”

35Ya mere, Onyenwe anyị mere ka ọrịa dị egwu bịakwasị ha, nʼihi ihe ha ji nwa ehi ahụ, bụ nke Erọn kpụrụ mee.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.