1Onyenwe anyị gwara Mosis, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, aga m edekwasị nʼelu ha okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ ahụ, bụ nke ị tụpịasịrị.
2Jikere nʼụtụtụ, rigoro ugwu Saịnaị ka i chee onwe gị nʼihu m nʼelu ugwu ahụ.
3Onye ọbụla esokwala gị, ma ọ bụkwanụ nọdụ nso ugwu ahụ. Ekwekwala ka igwe ehi maọbụ igwe atụrụ kpaa nri nso nso ugwu ahụ.”