Ọpụpụ 34

Jikere nʼụtụtụ, rigoro ugwu Saịnaị ka i chee onwe gị nʼihu m nʼelu ugwu ahụ.

Exodus 34:2 (UKJV) And be ready in the morning, and come up in the morning unto mount Sinai, and present yourself there to me in the top of the mount.

1Onyenwe anyị gwara Mosis, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, aga m edekwasị nʼelu ha okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ ahụ, bụ nke ị tụpịasịrị.

2Jikere nʼụtụtụ, rigoro ugwu Saịnaị ka i chee onwe gị nʼihu m nʼelu ugwu ahụ.

3Onye ọbụla esokwala gị, ma ọ bụkwanụ nọdụ nso ugwu ahụ. Ekwekwala ka igwe ehi maọbụ igwe atụrụ kpaa nri nso nso ugwu ahụ.”

4Mosis biliri nʼisi ụtụtụ, waa mbadamba nkume abụọ dịka ndị nke mbụ, rigoro ugwu Saịnaị dịka Onyenwe anyị gwara ya. Ọ jikwa nkume abụọ ahụ nʼaka ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.