Ọpụpụ 34

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu.

Exodus 34:10 (UKJV) And he said, Behold, I make a covenant: before all your people I will do marvels, such as have not been done in all the earth, nor in any nation: and all the people among which you are shall see the work of the LORD: for it is a terrible thing that I will do with you.

8Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala,

9sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.”

10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu.

11Debe ihe niile m nyere gị nʼiwu taa. Aga m esite nʼihu unu chụpụ ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus.

12Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ unu na-aba nʼime ya ghara ịgba ndụ. Ka ha ghara ị bụ ihe ịma nʼọnya nʼetiti unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.