Ọpụpụ 34

Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala,

Exodus 34:8 (UKJV) And Moses made haste, and bowed his head toward the earth, and worshipped.

6O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.

7Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.”

8Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala,

9sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.”

10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.