Ọpụpụ 34

Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.”

Exodus 34:7 (UKJV) Keeping mercy for thousands, forgiving iniquity and transgression and sin, and that will by no means clear the guilty; visiting the iniquity of the fathers upon the children, and upon the children's children, unto the third and to the fourth generation.

5Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ Onyenwe anyị.

6O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.

7Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.”

8Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala,

9sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.