25Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye.
26Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche.
27Ndị ndu niile wetakwara nkume ọniks na nkume ndị ọzọ nke ịhịọnye nʼihe a ga-eji dụọ efọọd na ihe mgbochi obi ahụ.
28Ha wetakwara ụda dị iche iche, mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, nke a ga-eji mee mmanụ otite dị nsọ, mekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
29Nʼụzọ dị otu a ka ụmụ Izrel niile, ma nwoke ma nwanyị, ndị chọrọ inyeaka nʼọrụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si weta onyinye ha. Onye ọbụla nʼime ha nyere Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu.