Ọpụpụ 35

Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche.

Exodus 35:26 (UKJV) And all the women whose heart stirred them up in wisdom spun goats' hair.

24Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere Onyenwe anyị, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ.

25Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye.

26Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche.

27Ndị ndu niile wetakwara nkume ọniks na nkume ndị ọzọ nke ịhịọnye nʼihe a ga-eji dụọ efọọd na ihe mgbochi obi ahụ.

28Ha wetakwara ụda dị iche iche, mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, nke a ga-eji mee mmanụ otite dị nsọ, mekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.